Herders -farmers conflict in Ngeria: Ihe mere Gov Ikpeazu ji kwụọ ndị ọchịehi ụgwọ

0

Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti ekwuola na ihe mere o ji nye ndị ochi ehi ego bụ ka udo chịa n’Okpuru Ọchịchị Ụkwa-East dị na steeti ahụ.

Nghọtahie dara n’etiti ndị ntorobia na ndị Fulani Ọchịehi na Ukwa -East nke mere ka ha gbuo otu ehi onye ọchịehi.

Mana gọvanọ Ikpeazu site n’ozi si n’ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC Igbo n’ekwentị na ịkwụ ụgwọ ehi abụghị n’ihi egwu kama ọ bụ iji gbochie tigbuo-zogbuo n’etiti ndị mpaghara ahụ na ndị Fulani ọchiehi.

Ihe onyonye pụtara na soshal midia gosiri ebe onye a kpọrọ Sam Nwogu n’aha gọvanọ Ikpeazu nyere otu onye Eze ego dị otu puku narị naịra na iri asa n’Ụkwa East.

Ego a bụ nke Nwogu kwuru na o si n’aka gọvanọ bụ maka iji kwụọ ndị ọchiehi ụgwọ n’ehi ha ndị ntoroọbịa obodo ahụ gburu.

Ndị nọ n’obieze mgbe nke a mere gụnyekwara onyeisioche okpuruọchịchị Ụkwa East bụ O. C Nwanuo.

Onye Eze were ego a nyefee onye na-anọchite anya ndị ọchịehi n’aka ma gwa ya ka ọ dọọ ndị nke ya aka na ntị ka ha ghara imebi ọrụụgbo ndị obodo ọzọ.

Agwa a gọvanọ kpara butere nkatọ si n’ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ ndị kwuru na ọ na-akwado ndị ọchịehi n’Abia Steeti.

Mana Ememanka kwuru na ego a gọvanọ Ikpeazu nyere bụ iji mezuo nkwa o kwere n’etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo maka ime udo n’Abia Steeti.

O kwuru na ọ bụghị maka ịtụ egwu kama na ọ bụ ka udo dị n’etiti ndị obodo ahụ na ndị ọchịehi.

N’okwu ya “Kama a ga-ekwe n’ihi ehi gbuo mmadụ, nye ndị a ego a ka ha gawa.”

“Ọ bụghị n’ihi ịtụ ụjọ, kama ọ bụ amamihe ka e ji achị steeti.”

https://www.bbc.com/igbo/afirika-48862331/embed”></iframe>

Comments are closed.