Liverpool vs Barcelona: Ngwongwo e jiri mara Barcelona akụwasịala

0

Lionel Messi a na-etu ‘GOAT’ tara ahịhịa ndụ taa dịka Liverpool jiri ha hichaa ala ọgbọegwuregwu Anfield.

Divock Origi bu ụzọ dọrie neetị ndị Barcelona na nkeji asaa e ji malite ịgba asọmpi a.

Georginio Wijnaldum sochiri ya azụ ma gbanye goolu abụọ n’ime nkeji 54 na 56 n’ọkara nke abụọ.

Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Origi azaa aha nna ya, ma tụkwasị ya ọzọ na nkeji 79, iji sị Barcelona “taa! kpuchie ọnụ!”

Lionel Messi na Luis Suarez bụ ndị Barcelona ji eme ọnụ, gbara elu, gbaa ala, mana otu abụghị n’ezi makana Liverpool jidere ha kechie.

Cheta na onye ọbụla che na Barcelona ga-egbu Liverpool egbu ka ha ji goolu atọ merie ha n’ụkwụ nke mbụ.

MessiImage copyrightGETTY IMAGES
Nkenke aha onyonyoMessi dị ka onye a wụrụ mmiri oyi

Ọkachasị oge ọ pụtara na Mohammed Salah na Roberto Firminho agaghị eso gbaa ya bụ egwuregwu.

Mana Liverpool tụgharịrị lie ha na ndụ n’azụ ụlọ ha, gwa ha “kparịkwaanụ onwe unu”.

N’ikpeazụ, Liverpool ji mkpokota goolu (4-3) merie.

Ka ọ dị ugbua, Liverpool awụbanyela n’agba ikpeazụ a ga-agba n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun.

Nke a ga-eme ya afọ abụọ na-eso onwe ha, ha na-agba ikpeazụ asọmpi Champions League.

BBC Igbo

Comments are closed.