Abia state: Ịga steeti a ga-agụ gị agụụ ma ị hụchaa akụkọ a

6

Abia state: Ịga steeti a ga-agụ gị agụụ ma ị hụchaa akụkọ aKa ị ma nke a, ị ma nke ọzọ gbasara Abia steeti?
Kedụ ihe ndị mara mma ọtụtụ ndị amaghị maka steeti ebe i si?

Kedụ ihe ndị ị nụrụla maka Abịa steeti ma nke ọma ma nke ọjọọ?

Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ndị ga-asị gị “tụfịakwa! Enweghi m ike ibi na steeti a”, mana ọ bụ makana ha amaghị na e nwere uru dị n’ibi n’ime ya.

BBC Igbo chọrọ ịtụpenye gị azụ gbasara ihe ndị ga-agụ gị agụụ ibi na steeti ọma a a na-akpọ “steeti nke Chukwu”.

1) Azụmahịa:

Akpụkpụ ụkwụ

E nwere ike ikwute okwu Abịa steeti ghara ibu ụzọ ekwu okwu azụmahịa?

Ndị obodo ejighi iji ego achụ ego egwu egwu, nke kpatara na ha nwere ọtụtụ ahịa na-ekwo ekwo ma na-ewu ewu.

E nwee ka ị si fugide ụzọ hụ onwe gị n’ime Arịarịa, Ahịa ọhụrụ, Isi gate maọbụ nke a na-akpọ “shopping center”, dịrị njikere ibupute ego gị zụọ ihe dị iche iche mara mma.

2)War Museum/Ojukwu Bunker:

Media captionBiafra: Gịnị nọ n’ime Bọnka Ojukwu

Ị bụrụ onye Igbo na-amaghị maka akụkọ agha Biafra, Abịa steeti ga-enyeju gị afọ n’ihe gbasara ya.

Ị gaa na War Museum dị n’Ụmụahịa, ị ga-ahụju anya.

Site na ngwa agha ndị Igbo ji lụọ agha ahụ, nakwa ebe Odimegwu Ojukwu bụ ọchiagha bi n’ime ala mgbe agha a birila ọkụ, ihe ga-eju gị anya juru n’ime ebe ahụ.

3) Nrụpụta ihe:

Ndị Abịa bụ ndị na-emegharị aka ma a bịa n’ịrụpụta ihe.

Ọ ga-ara ahụ ịhụ ihe ị na-agaghị arụnwu n’Aba dị n’Abịa, nke mere ka ụfọdụ ndị na-akpọ ha ndị “Chaịna nke mpaghara Afrịka”.

A bịa n’akwa, ha nwere ‘faktrị’, a bịa n’ịrụpụta akpụkpọụkwụ, ha bụ dachịị.

Media caption‘Uche m bụ inye ọtụtụ ntọrọbịa Igbo ọrụ’

4) Ọgbọegwuregwu Enyimba:

A ga-akọwa akụkọ Aba ghara ikwute okwu ndị otu egwuregwu Enyimba?

Ha so na ndị na-ebutere Abịa steeti, ọkachasị Aba, aha ọma.

EnyimbaImage copyrightGETTY IMAGES
Nkenke aha onyonyoEnyimba maburu iko Champions League nke mba Afrịka n’afọ 2003

Ha na-akpakwa ike n’egwuregwu ma na Naịjirịa ma na mba Afrịka.

Ọgbọegwuregwu ha dị n’Aba so na ndị e ji eme ọnụ na Naịjirịa.

5)Ị makwa na ọ bụ ndị Abịa steeti na-eme akwa akwaete?

Akwaete

Akwaete so na njirimara ndị Igbo, nke e ji eme ọnụ.

6) Okwu e ji mara ndị Aba (slangs)

Ahia akpụkpụ ụkwụ

Kedụ ndị kacha atụpụta okwu ndị ahụ na-atọwa ntị ndị Igbo na-eji akpa nkata?

Ndị Aba ga-eji okwu kpọfee gị oge ọbụla, ma na mma ma na njọ.

Okwu ndị dị ka “nwanne gbara ọgwụ gị ṅụọ”, “udo ma akwa”, “a na-akọrọ onye ọcha?” na ndị ọzọ, nwere ike ịkpa gị ọchị maọbụ kpasuo gị iwe.

Onye Aba achọghị ịma, ọ ga-ekwu ka ọ ha ya n’ọnụ.

Kedụkwanụ maka “Aba nọọ jii, Aba ajụ”?, kedụkwanụ ndị e ji “ndị yọk” mara?

BBC Igbo

Comments are closed.