Keke ga-ebidozi gbawa ruo elekere itoolu n’Aba na Umuahia

0

Keke ga na agbaruzi elekere itoolu nke abali

Odeakwụkwọ mgbasa ozị gọọmenti Abia Steeti bụ Onyebuchi Ememanka ekwuola na gọọmenti Steeti ahụ agbatịala awa ndị keke na-arụ ọrụ na Steeti ahụ site elekere asaa ruo elekere itoolu nke abali.

Gọọmenti Abia steeti gbubiburu awa ndị Keke ji arụ ọrụ ruo elekere asaa ụbọchi niile maka mpu na ohi a na-ebo ndị ọrụ ahụ.

Mana ugbua, Ememanka kwuru na ndị otu keke akpọrọ Abia State Amalgamated Tricycle Owners Association kwetere na ha ga-etinye aka na-ikpochapụ ndị ajọọ mmadụ nọ n’ime ha igbochi iji ya bụ ụgbọ njem eme mpụ.

Ememanka sị na ” ọ bụ nke a mere gọọmenti jiri nwee mmasị ịmegharị ya bụ iwu,”nke bụ na ugbua, keke ga na-akwụsịzị n’elekere itoolu nke abalị.

 

(BBC IGBO)

Comments are closed.